Jeremaya 33:21
Jeremiah 33:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
Jeremiah 33:21 in English
Jeremiah 33:21 · Berean Standard Bible
then My covenant may also be broken with David My servant and with My ministers the Levites who are priests, so that David will not have a son to reign on his throne.
Context
19Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 20“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha, 21mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 22Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” 23Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.