Native Bible

Jeremiah 33:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Jeremiah 33:11 in English

Jeremiah 33:11 · Berean Standard Bible

the sounds of joy and gladness, the voices of the bride and bridegroom, and the voices of those bringing thank offerings into the house of the LORD, saying: ‘Give thanks to the LORD of Hosts, for the LORD is good; His loving devotion endures forever.’ For I will restore the land from captivity * as in former times, says the LORD.

Context

9Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’ 10“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa 11olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike. 13Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.