Jeremaya 32:22
Jeremiah 32:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị nyere ha ala a, nke ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
Jeremiah 32:22 in English
Jeremiah 32:22 · Berean Standard Bible
You gave them this land that You had sworn to give their fathers, a land flowing with milk and honey.
Context
20Ọ bụ gị mere ihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche nʼIjipt. Ị nọgidekwara na-arụ ha ruo taa, ma nʼala Izrel ma nʼetiti ndị niile nọ nʼụwa. Nʼihi ya, i meere onwe gị aha nke ka bụkwa nke gị nʼebe niile. 21Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt. 22Ị nyere ha ala a, nke ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 23Ha batara nʼala a, nweta ya, ma ha jụrụ irubere gị isi, maọbụ jegharịa nʼiwu gị; ha emeghị ihe ndị i nyere ha nʼiwu mee. Nʼihi ya, i mere ka ihe ọjọọ ndị a bịakwasị ha. 24“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.