Jeremaya 32:1
Jeremiah 32:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza.
Jeremiah 32:1 in English
Jeremiah 32:1 · Berean Standard Bible
This is the word that came to Jeremiah from the LORD in the tenth year of Zedekiah king of Judah, which was the eighteenth year of Nebuchadnezzar.
Context
1Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza. 2Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda. 3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.