Jeremaya 29:8
Jeremiah 29:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ.
Jeremiah 29:8 in English
Jeremiah 29:8 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: “Do not be deceived by the prophets and diviners among you, and do not listen to the dreams you elicit from them.
Context
6lụọnụ nwunye, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; lụọkwaranụ ụmụ unu ndị ikom nwunye, kwenyekwanụ ka ụmụ unu ndị inyom lụọ di, ka ha mụọkwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mụbaanụ nʼebe ahụ, unu ebilatakwala. 7Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.” 8Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ. 9Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.