Jeremaya 29:30
Jeremiah 29:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,
Jeremiah 29:30 in English
Jeremiah 29:30 · Berean Standard Bible
Then the word of the LORD came to Jeremiah:
Context
28O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ” 29Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma. 30Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị, 31“Zigara ndị ahụ niile e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ ozi sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shemaya onye Nehelam, Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma mee ka unu tụkwasị obi unu nʼokwu ụgha ya, ma ọ bụghị m ziri ya, 32ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.