Jeremaya 29:3
Jeremiah 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.
Jeremiah 29:3 in English
Jeremiah 29:3 · Berean Standard Bible
The letter was entrusted to Elasah son of Shaphan and Gemariah son of Hilkiah, whom Zedekiah king of Judah sent to King Nebuchadnezzar in Babylon. It stated:
Context
1Ihe ndị a bụ ihe dị nʼakwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jerusalem degaara ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị okenye, na ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị Izrel Nebukadneza dọtara nʼagha si na Jerusalem bulaa ha Babilọn. 2Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ. 3Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi. 4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn, 5“Wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya; kụọnụ ihe nʼubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.