Jeremaya 29:27
Jeremiah 29:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere i ji hapụ ịbasiri Jeremaya, onye Anatot mba ike, onye na-eme onwe ya onye amụma nʼetiti unu?
Jeremiah 29:27 in English
Jeremiah 29:27 · Berean Standard Bible
So now, why have you not rebuked Jeremiah of Anathoth, who poses as a prophet among you?
Context
25Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “I dere akwụkwọ zigara ndị niile bi na Jerusalem, ha na Zefanaya nwa Maaseia onye nchụaja, na ndị nchụaja ndị ọzọ. Ị gwara Zefanaya okwu nʼakwụkwọ ahụ sị ya, 26‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya. 27Gịnị mere i ji hapụ ịbasiri Jeremaya, onye Anatot mba ike, onye na-eme onwe ya onye amụma nʼetiti unu? 28O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ” 29Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.