Native Bible

Jeremiah 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.

Jeremiah 28:2 in English

Jeremiah 28:2 · Berean Standard Bible

“This is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘I have broken the yoke of the king of Babylon.

Context

1O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m. 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn. 3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn. 4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.