Jeremaya 28:13
Jeremiah 28:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe.
Jeremiah 28:13 in English
Jeremiah 28:13 · Berean Standard Bible
“Go and tell Hananiah that this is what the LORD says: ‘You have broken a yoke of wood, but in its place you have fashioned a yoke of iron.’
Context
11Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa. 12Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba* ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 13“Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe. 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ” 15Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.