Jeremaya 27:5
Jeremiah 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.
Jeremiah 27:5 in English
Jeremiah 27:5 · Berean Standard Bible
By My great power and outstretched arm, I made the earth and the men and beasts on the face of it, and I give it to whom I please.
Context
3Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi. 4Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị, 5Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma. 6Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu. 7Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.