Native Bible

Jeremiah 27:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.

Jeremiah 27:16 in English

Jeremiah 27:16 · Berean Standard Bible

Then I said to the priests and to all this people, “This is what the LORD says: Do not listen to the words of your prophets who prophesy to you, saying, ‘Look, very soon now the articles from the house of the LORD will be brought back from Babylon.’ They are prophesying to you a lie.

Context

14Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu. 15‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ” 16Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu. 17Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe? 18Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.