Jeremaya 26:8
Jeremiah 26:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ!
Jeremiah 26:8 in English
Jeremiah 26:8 · Berean Standard Bible
and as soon as he had finished telling all the people everything the LORD had commanded him to say, the priests and prophets and all the people seized him, shouting, “You must surely die!
Context
6mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ” 7Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile. 8Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ! 9Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 10Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.