Jeremaya 26:2
Jeremiah 26:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.
Jeremiah 26:2 in English
Jeremiah 26:2 · Berean Standard Bible
“This is what the LORD says: Stand in the courtyard of the house of the LORD and speak all the words I have commanded you to speak to all the cities of Judah who come to worship there. Do not omit a word.
Context
1Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, Onyenwe anyị mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị. 2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu. 3Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha. 4Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.