Jeremaya 26:19
Jeremiah 26:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”
Jeremiah 26:19 in English
Jeremiah 26:19 · Berean Standard Bible
Did Hezekiah king of Judah or anyone else in Judah put him to death? Did Hezekiah not fear the LORD and seek His favor, and did not the LORD relent of the disaster He had pronounced against them? But we are about to bring great harm on ourselves!”
Context
17Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị, 18“Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:
“ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi.
Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’ 19“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.” 20(Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu. 21Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.