Jeremaya 25:9
Jeremiah 25:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
Jeremiah 25:9 in English
Jeremiah 25:9 · Berean Standard Bible
behold, I will summon all the families of the north, declares the LORD, and I will send for My servant Nebuchadnezzar king of Babylon, whom I will bring against this land, against its residents, and against all the surrounding nations. So I will devote them to destruction * and make them an object of horror and contempt, an everlasting desolation.
Context
7“Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.” 8Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m. 9Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi. 10Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya. 11Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.