Native Bible

Jeremiah 25:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.

Jeremiah 25:6 in English

Jeremiah 25:6 · Berean Standard Bible

Do not follow other gods to serve and worship them, and do not provoke Me to anger with the works of your hands. Then I will do you no harm.’

Context

4Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu. 5Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi. 6Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ. 7“Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.” 8Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.