Jeremaya 25:33
Jeremiah 25:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
Jeremiah 25:33 in English
Jeremiah 25:33 · Berean Standard Bible
Those slain by the LORD on that day will be spread from one end of the earth to the other. They will not be mourned, gathered, or buried. They will be like dung lying on the ground.
Context
31Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo.
Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile,
meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 32Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, mbibi na-agbasa
site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ;
oke ifufe na-abịakwa
site na nsọtụ niile nke ụwa.” 33Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi. 34Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa;
tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ.
Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola,
unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja. 35Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ;
ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.