Jeremaya 23:29
Jeremiah 23:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,* Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe* nke na-etiwasị nkume?”
Jeremiah 23:29 in English
Jeremiah 23:29 · Berean Standard Bible
“Is not My word like fire,” declares the LORD, “and like a hammer that smashes a rock?”
Context
27Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal. 28Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 29“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,* Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe* nke na-etiwasị nkume?” 30Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya. 31E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.