Jeremaya 22:1
Jeremiah 22:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.
Jeremiah 22:1 in English
Jeremiah 22:1 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “Go down to the palace of the king of Judah and proclaim this message there,
Context
1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a. 2‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. 3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.