Jeremaya 21:8
Jeremiah 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.
Jeremiah 21:8 in English
Jeremiah 21:8 · Berean Standard Bible
Furthermore, you are to tell this people that this is what the LORD says: ‘Behold, I set before you the way of life and the way of death.
Context
6Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha. 7Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’ 8“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. 9Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.