Native Bible

Jeremiah 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu.

Jeremiah 21:5 in English

Jeremiah 21:5 · Berean Standard Bible

And I Myself will fight against you with an outstretched hand and a mighty arm, with anger, fury, and great wrath.

Context

3Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya, 4‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a. 5Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu. 6Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha. 7Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.