Jeremaya 19:2
Jeremiah 19:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị.
Jeremiah 19:2 in English
Jeremiah 19:2 · Berean Standard Bible
and go out to the Valley of Ben-hinnom near the entrance of the Potsherd Gate. Proclaim there the words I speak to you,
Context
1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja, 2jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị. 3Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru. 4Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.