Jeremaya 19:13
Jeremiah 19:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ”
Jeremiah 19:13 in English
Jeremiah 19:13 · Berean Standard Bible
The houses of Jerusalem and the houses of the kings of Judah will be defiled like that place, Topheth—all the houses on whose rooftops they burned incense to all the host of heaven and poured out drink offerings to other gods.”
Context
11Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ. 12Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka Tofet. 13Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ” 14Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ Onyenwe anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha, 15“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”
19:9 Gbochie nri ọbụla isite nʼezi rute ha aka
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.