Jeremaya 13:11
Jeremiah 13:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 13:11 in English
Jeremiah 13:11 · Berean Standard Bible
For just as a loincloth clings to a man’s waist, so I have made the whole house of Israel and the whole house of Judah cling to Me, declares the LORD, so that they might be My people for My renown and praise and glory. But they did not listen.
Context
9“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem. 10Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla. 11Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’ 13Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.