Jeremaya 10:24
Jeremiah 10:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
Jeremiah 10:24 in English
Jeremiah 10:24 · Berean Standard Bible
Correct me, O LORD, but only with justice— not in Your anger, or You will bring me to nothing.
Context
22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,
oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,
ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,
ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa. 23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,
na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso. 24Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,
ma ọ bụghị site nʼiwe gị,
ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu. 25Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche
bụ ndị na-amaghị gị,
wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị.
Nʼihi na ha eripịala Jekọb,
ha eripịala ya kpamkpam,
bibiekwa ebe obibi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.