Ndị Ikpe 9:33
Judges 9:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”
Judges 9:33 in English
Judges 9:33 · Berean Standard Bible
And in the morning at sunrise, get up and advance against the city. When Gaal and his men come out against you, do to them whatever you are able.”
Context
31O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị. 32Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa. 33Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.” 34Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ. 35Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.