Ndị Ikpe 9:3
Judges 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”
Judges 9:3 in English
Judges 9:3 · Berean Standard Bible
And when his mother’s brothers spoke all these words about him in the presence of all the leaders of Shechem, their hearts were inclined to follow Abimelech, for they said, “He is our brother.”
Context
1Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha, 2“Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.” 3Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.” 4Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya. 5Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.