Native Bible

Judges 8:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.

Judges 8:21 in English

Judges 8:21 · Berean Standard Bible

Then Zebah and Zalmunna said, “Get up and kill us yourself, for as the man is, so is his strength.” So Gideon got up and killed Zebah and Zalmunna, and he took the crescent ornaments from the necks of their camels.

Context

19Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.” 20O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha. 21Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu. 22Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.” 23Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.