Native Bible

Judges 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?

Judges 8:2 in English

Judges 8:2 · Berean Standard Bible

But Gideon answered them, “Now what have I accomplished compared to you? Are not the gleanings of Ephraim better than the grape harvest of Abiezer?

Context

1Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu. 2Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza? 3Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ. 4Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.