Ndị Ikpe 8:18
Judges 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”
Judges 8:18 in English
Judges 8:18 · Berean Standard Bible
Next, Gideon asked Zebah and Zalmunna, “What kind of men did you kill at Tabor?” “Men like you,” they answered, “each one resembling the son of a king.”
Context
16O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe. 17Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile. 18Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?”
Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.” 19Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.” 20O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.