Native Bible

Judges 6:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.”

Judges 6:39 in English

Judges 6:39 · Berean Standard Bible

Then Gideon said to God, “Do not be angry with me; let me speak one more time. Please allow me one more test with the fleece. This time let it be dry, and the ground covered with dew.”

Context

37lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.” 38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi. 39Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.” 40Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ. 6:1 Ndị Midia, bụ ndị si nʼotu agbụrụ nʼime ụmụ ndị Ketura mụtara Ebraham.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.