Ndị Ikpe 6:25
Judges 6:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Were oke ehi nna gị, bụ oke ehi nke abụọ, nke gbara afọ asaa. Dọtuo ebe ịchụ aja nna gị wuru maka Baal, gbutukwaa ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya.
Judges 6:25 in English
Judges 6:25 · Berean Standard Bible
On that very night the LORD said to Gideon, “Take your father’s young bull and a second bull seven years old, tear down your father’s altar to Baal, and cut down the Asherah pole beside it.
Context
23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.” 24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa. 25Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Were oke ehi nna gị, bụ oke ehi nke abụọ, nke gbara afọ asaa. Dọtuo ebe ịchụ aja nna gị wuru maka Baal, gbutukwaa ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya. 26Mgbe ahụ, wuoro Onyenwe anyị bụ Chineke gị ebe ịchụ aja, nʼelu ebe a dị oke elu. Jiri osisi Ashera ahụ nke ị gbuturu kwanye ọkụ, chụọ oke ehi nke abụọ ahụ dịka aja nsure ọkụ.” 27Ya mere, Gidiọn duuru mmadụ iri site na ndị na-ejere ya ozi, ndị nyeere ya aka imezu ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Kama, site nʼegwu maka ndị ikwu nna ya, na ndị bi nʼobodo ahụ, o mere ihe ndị a niile nʼime abalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.