Ndị Ikpe 4:9
Judges 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.
Judges 4:9 in English
Judges 4:9 · Berean Standard Bible
“I will certainly go with you,” Deborah replied, “but the road you are taking will bring you no honor, because the LORD will be selling Sisera into the hand of a woman.” So Deborah got up and went with Barak to Kedesh,
Context
7Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’ ” 8Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.” 9Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh. 10Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee. 11Nʼoge a, Heba,* onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.