Ndị Ikpe 4:6
Judges 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
Judges 4:6 in English
Judges 4:6 · Berean Standard Bible
She summoned Barak son of Abinoam from Kedesh in Naphtali and said to him, “Surely the LORD, the God of Israel, is commanding you: ‘Go and march to Mount Tabor, taking with you ten thousand men of Naphtali and Zebulun.
Context
4Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel. 5Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile. 6O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa. 7Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’ ” 8Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.