Ndị Ikpe 4:3
Judges 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.
Judges 4:3 in English
Judges 4:3 · Berean Standard Bible
Then the Israelites cried out to the LORD, because Jabin had nine hundred chariots of iron, and he had harshly oppressed the Israelites for twenty years.
Context
1Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị. 2Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim. 3Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka. 4Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel. 5Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.