Native Bible

Judges 4:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.

Judges 4:18 in English

Judges 4:18 · Berean Standard Bible

Jael went out to greet Sisera and said to him, “Come in, my lord. Come in with me. Do not be afraid.” So he entered her tent, and she covered him with a blanket.

Context

16Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 17Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken. 18Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya. 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya. 20Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.