Native Bible

Judges 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

Judges 4:14 in English

Judges 4:14 · Berean Standard Bible

Then Deborah said to Barak, “Arise, for this is the day that the LORD has delivered Sisera into your hand. Has not the LORD gone before you?” So Barak came down from Mount Tabor with ten thousand men following him.

Context

12Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa, 13Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn. 14Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa. 15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ. 16Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.