Native Bible

Judges 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.

Judges 3:7 in English

Judges 3:7 · Berean Standard Bible

So the Israelites did evil in the sight of the LORD; they forgot the LORD their God and served the Baals and the Asherahs.

Context

5Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus. 6Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye,* werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe. 7Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe. 8Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ. 9Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.