Native Bible

Judges 21:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.

Judges 21:14 in English

Judges 21:14 · Berean Standard Bible

And at that time the Benjamites returned and were given the women who were spared from Jabesh-gilead. But there were not enough women for all of them.

Context

12Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha. 13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo. 14Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile. 15Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu. 16Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.