Ndị Ikpe 20:39
Judges 20:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”
Judges 20:39 in English
Judges 20:39 · Berean Standard Bible
the men of Israel would turn in the battle. When the Benjamites had begun to strike them down, killing about thirty men of Israel, they said, “They are defeated before us as in the first battle.”
Context
37Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ. 38Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ, 39ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha.
Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.” 40Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ. 41Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.