Ndị Ikpe 20:35
Judges 20:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha.
Judges 20:35 in English
Judges 20:35 · Berean Standard Bible
The LORD defeated Benjamin in the presence of Israel, and on that day the Israelites slaughtered 25,100 Benjamites, all armed with swords.
Context
33Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta. 34Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha. 35Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha. 36Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha.
Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea. 37Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.