Native Bible

Judges 20:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ.

Judges 20:27 in English

Judges 20:27 · Berean Standard Bible

And the Israelites inquired of the LORD. (In those days the ark of the covenant of God was there,

Context

25Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha. 26Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ. 27Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ. 28Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.” 29Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.