Ndị Ikpe 20:13
Judges 20:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.” Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị.
Judges 20:13 in English
Judges 20:13 · Berean Standard Bible
Hand over the wicked men of Gibeah so we can put them to death and purge Israel of this evil.” But the Benjamites refused to heed the voice of their fellow Israelites.
Context
11Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ. 12Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu? 13Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.”
Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị. 14Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha. 15Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.