Native Bible

Judges 20:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.”

Judges 20:10 in English

Judges 20:10 · Berean Standard Bible

We will take ten men out of every hundred from all the tribes of Israel, and a hundred out of every thousand, and a thousand out of every ten thousand, to supply provisions for the army when they go to Gibeah * in Benjamin to punish them for the atrocity they have committed in Israel.”

Context

8Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya. 9Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha. 10Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.” 11Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ. 12Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.