Native Bible

Judges 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu,

Judges 2:1 in English

Judges 2:1 · Berean Standard Bible

Now the angel * of the LORD went up from Gilgal to Bochim and said, “I brought you up out of Egypt and led you into the land that I had promised to your fathers, and I said, ‘I will never break My covenant with you,

Context

1Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu, 2unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a? 3Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.*’ ”*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.