Native Bible

Judges 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya.

Judges 19:7 in English

Judges 19:7 · Berean Standard Bible

The man got up to depart, but his father-in-law persuaded him, so he stayed there that night.

Context

5Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.” 6Ya mere, ha abụọ nọdụrụ ala rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Mgbe e mesiri, nna nwaagbọghọ ahụ sịrị ha, “Biko, nọdụnụ rahụ ụra nʼabalị taa, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.” 7Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya. 8Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ. 9Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.