Ndị Ikpe 19:26
Judges 19:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.
Judges 19:26 in English
Judges 19:26 · Berean Standard Bible
Early that morning, the woman went back to the house where her master was staying, collapsed at the doorway, and lay there until it was light.
Context
24Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.” 25Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa. 26Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie. 27Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ. 28Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.