Ndị Ikpe 19:15
Judges 19:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya.
Judges 19:15 in English
Judges 19:15 · Berean Standard Bible
They stopped to go in and lodge in Gibeah. The Levite went in and sat down in the city square, but no one would take them into his home for the night.
Context
13O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.” 14Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin. 15Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya. 16Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin). 17Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.