Native Bible

Judges 19:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.

Judges 19:10 in English

Judges 19:10 · Berean Standard Bible

But the man was unwilling to spend the night. He got up and departed, and arrived opposite Jebus (that is, Jerusalem), with his two saddled donkeys and his concubine.

Context

8Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ. 9Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.” 10Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị. 11Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.” 12Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.